Macbeth
From Wikipedia, the free encyclopedia
Macbeth (asụsụ Bekee: The Tragedy of Macbeth, 'egwu mberede Macbeth') bụ ejije ọdachi nke William Shakespeare dere n'ahọ 1606.[1] Ejije nka bụ maka Macbeth, eze ndị Scotland. Macbeth bụbụ mmadụ̀ n'ịta na okwu mba ndị, mana Shakespeare gbanwere ya maka Eze James I nke Ala Bekee (ọ bụkwa Eze James VI nke Ala Ndị Skọtụ).[2] Ejije ọdachi nka na-egosi otu ịchọ ike na ọchịchị nwere ike imebì ndị mmadụụ. Macbeth bụọ onye nwere osi si ike mgbe ọ bụ onye isi ndị agha na ọ bụ Thane ǹkè Glamis (onye na-achị Glamis) mana amụosu a atọ bịara, gwa ya na ọ ga-abụ eze ndị Skọtụ. N'ime obì ya, Macbeth ma ịhe à ekwesịghị ịme maka Duncan bụ eze na-achị achị. Macbeth na nwunye ya, Lọọlọ Macbeth (Bekee: Lady Macbeth), gburu Duncan ka Macbeth bụrụ eze Ndị Skọtụ. Maka ha mere ịhe à, ara ebidozi ị yàa ha, tupu Lady Macbeth gburu onwe ya naMacduff, Thane nke Fife, gburu Macbeth. Mgbe ịhe ndị à niile mechara, Malcolm, nwa izizi Duncan, bụrụ Eze Ndị Skọtụ.[1]
Oge/afọ mmalite | 1606 |
---|---|
aha | Macbeth |
form of creative work | play |
ụdị | ejije obi mwute |
Odee akwụkwọ | William Shakespeare |
asụsụ eji dee ọrụ | Early Modern English, Bekee |
afọ/ụbọchị mbipụta | 1623 |
depicts | Fair is foul, and foul is fair, double, double, toil and trouble |
first line | When shall we three meet againe? |
last line | It is a peerelesse Kinsman. |
time period | Renaissance |
ebipụtara na | First Folio |
copyright status | Public domain, Public domain |
narrative motif | army appears like forest |