Ndepụta ndị zụtarala ma nweta Boeing 737 MAX ha
From Wikipedia, the free encyclopedia
Nke a na-edepụta ndi niile zụtarala ụgbọelu Boeing 737 MAX nke dị na ngalaba ụgbọ elu, nke ndi Boeing Commercial Airplanes , nkewa nke Boeing Company na-arụpụta ugbua.
Na mbụ, ndị ahịa na-azu 737 MAX abụghị ndị a mara ma e wezụga ụgbọ elu America . Na November 17, 2011, Boeing wepụtara aha ndị ahịa abụọ ọzọ - Lion Air na Aviation Capital Group . N'oge ahụ, Boeing kọrọ maka ndị ahịa ha di itoolu zụrụru ụgbọ elu 737 MAX ruru 700. [1] [2] Mgbe ahụ, na Disemba 13, 2011, Southwest Airlines kwupụtara na ha ga-abụ ndị mbụ ga azụ 737 MAX site na-izu ụgbọelu ruru 150 nakwa nhọrọ ruru 150. [3] [4]
N'abali 31, n'ọnwa mbụ n'afọ 2019, ndị Boeing nwere azụmahịa 737 MAX ruru 5,011 site na ndị ahịa ya ruru 79, [5] na ụlọ ọrụ atọ kachasị azụ ahịa 737 MAX bụ: Southwest Airlines na azụmahịa 280, Flydubai tinyere ọnụ maka 251 na Lion Air manyere ọnụ maka 201. [5]