Ọgbakọ Otú United Nations Fremewok maka Ngbanwe Iru igwe
From Wikipedia, the free encyclopedia
Ọgbakọ Ukwu Nke United 22² Nations maka Ngbanwe Ịrụ igwe hiwere nkwekọrịta gburugburu ebe obibi nke mba ụwa iji luso "ntụnye aka dị n ize ndụ nke ụmụ mmadụ na usoro ihu igwe ", n' otu akụkụ Drsite na ịkwado mkpokọta gas griin na ikuku. [1] Mba dị otú narị na iri ịse na anọ bịanyere aka na ya na ogbako Mba ndị nọ n 'Otu United Nations Conference on Environment and Development (UNCED), nke a na-akpọkarị Nzukọ mba Ụwa, nke emere na Rio de Janeiro site na abali atọ rue abalị iri na anọ nke ọnwa Junn n' afọ otu puku, narị itolu na iri itolu na abụọ. O hiwere isi ụlọ ọrụ Sekteret na Bonn wee malite ọrụ n' ọzụzụ na mgbe ọnwa Maachị gbàrà nkpuru ubọchi iri abụo na otu n' afọ otu puku, nari itolu na iri itolu na anọ. [2] Nkwekọrịta ahụ na- akpọ maka nyoocha sayensị , n' ịnwe nzukọ mgbe nile, ngụkọta uche, mkparịta ụka,na nkwekọrịta nkwenyere na usoro ọdịnihu nke gburugburu ebe obibi ịnabata na ị kwenyere mgbanwe ịrụ ìgwè, iji hụ na iko pụta ìhè oriri enweghị ihe ọ bụla bụ ihe ị maka n' iru iji mee mkpụrụ ụbọchị ka usoro ihe mmepeụzo na akụ ụba na-aga n'ihu n'ụzọ kwesịrị ekwesị. [2] [3]
Oge/afọ mmalite | 9 Mee 1992 |
---|---|
aha mkpirisi | UNFCCC, CCNUCC |
ikike | UNFCCC secretariat |
oge omelu | 4 Jụn 1992 |
afọ/ụbọchị mbipụta | 9 Mee 1992 |
webụsaịtị | http://unfccc.int/ |
amended by | Kyoto protocol |
depositary | United Nations Secretary-General |
effective date | 21 Maachị 1994 |
N' Ihe banyere Kyoto Ptotocol, nke a bịanyere aka na ya n' afọ otú puku, narị itoolu na iri itoolu na asaa, ma rụọ ọrụ malite na afọ puku abụọ na ise rue n' afọ puku abụọ na iri abụọ bụ nke mbụ mmejuputa usoro n'okpuru UNFCCC. Nkwekọrịta Paris dochie Protocol Kyoto, nke malitere na afọ puku abụọ na iri na isii [4]. Malite n' afọ puku abụọ na iri abụọ UNFCCC nwere pati steeti otú narị na iri itolu na asaa . Òtù na-eme mkpebi ya kachasị elu, bụ nzukọ nke Ndị otu (COP), na-ezukọ kwa afọ iji chọpụta ọganihu n'imeso mgbanwe ihu igwe. [5]
Nkwekọrịta ahụ wepụtara ọrụ dị iche iche maka mpaghara atọ nke mba ndị bịanyere aka n'akwụkwọ. Ndị a bụ mba ndị mepere emepe, mba ndị mepere emepe nwere ọrụ ego pụrụ iche na mba ndị nke ka na -emepe emepe . [3] Mba ndị mepere emepe, nke a na-akpọkwa mba Annex 1, nwere steeti iri atọ na asatọ na mbụ, iri na atọ n'ime ha bụ steeti Eastern Europe na mgbanwe ọchịchị onye kwuo uche ya n' akụ na ụba, azum ahịa, yana European Union . Ha niile bụ nke Òtù Na-ahụ Maka Njikọ Akụ na ụba na mmepe (OECD). A na-akpọ mba Annex (1) ka ha nakwere atumatu mba wee mee usoro Nkwekọrịta na mbelata mgbanwe iru igwe site na ịmachi ikuku na ikuku nke ikuku griin ha na ịkọ akụkọ usoro ewepụtara n'ebum n' obi nke ịlaghachi n'otu n'otu ma ọ bụ njikọtaọnụ na ọkwa ikuku nke afọ otu puku na narị itolu na iri itolu ha. [3] Mba ndị mepere emepe nwere ọrụ ego pụrụiche nke na-akpọkwa mba Annex II. Ha gụnyere mba Annex I niile ma ewezuga ndị na-agbanwe na ọchịchị onye kwuo uche ya na akụ n' ụba na ahịa. A na-akpọ mba Annex II ka ha weta ego tọrọ atọ na mgbakwunye ego iji gboo ụgwọ ndị mba ndị ka na-emepe emepe na-enweta na irube isi n'ọrụ ha imepụta ngwaahịa mba nke ihe ọkụkụ ha site na isi mmalite yana mwepụ ha site na sinks maka ikuku griin na-adịghị achịkwa nke Montreal Protocol . . [3] Mba ndị na-emepe emepe ga-ebufe ngwa ahịa ha n'aka ndị odeakwụkwọ UNFCCC. [3] N'ihi na steeti ndị isi bịanyere aka na ya anaghị erube isi na nkwa nke onye ọ bụla, a katọrọ UNFCCC dị ka enweghị ike ịga nke ọma n'ibelata ikuku carbon dioxide kemgbe ejiri hiwe ya. [6]